Τρίτη 24 Σεπτεμβρίου 2019

NAPTIP akpọchiela otu ebe a na-atụ mgbere ụmụaka


Ịtụ mgbere ahịa ụmụaka agbalitela n'ala ọwụwa anyanwụ Naijirịa

bbc.com / igbo
 
Otu na-ahu maka imegide ndi na-atụ mgbere ahia a kpọrọ NAPTIP na aha ịchafụ, anụchiela otu dibịa otụmọkpọ na-atu mgbere ahia ụmụaka.
Ụmụnwaanyị ndị ihe dị ọsịsọ na-achọ imụ nwa na-agakwuru ya ka o nye ha nwa.
Itụ mgbere ahia ụmụaka aghọla nnukwụ ahịa na-amụtara ndị nọ n'ime ya ọtụtụ nde naira.
NAPTIP kpọchikwara ụlọọgwu ọdịnala akụkọ kwuru na dibia ọtụmọkpọ ahụ ji atụ mgbere ahịa ụmụaka.
Josiah Emerole bụ ọnụ na-ekwuchitere NAPTIP gwara BBC na a nwụchịrị otụ dibia mgbọrọgwụ na-atụ mgbere ahịa ụmụaka n'Abuja.
O kwukwara na akụkọ kwuru na ndị ụweojii nwụchiri otu nwaanyị enwudere na Dịsemba kụ nwa amụrụ ọhụrụ.
"Nwaanyị ahụ kuru nwa ahụ si Abuja na-aga Niger steeti,mgbe e nwudere ya o nweghị ike ikọwa ka ya bụ nwa siri baa ya aka.Ndị uweojii were ya bụ ikpe nyefee ndị NAPTIP.
Kemgbe ahụ anyị na-esochi ya bụ dibịa na-atụ mgbere ahịa ụmụaka anya rue izuụka abụọ gara aga mgbe anyị nwuchịrị ya.
"Mgbe anyi nwuchiri ya bụ dibịa anyi chọpụtara ọtụtụ ọgwụ mgbọrọgwu oji arụ ọrụ na be ya.
Nwaanyị ahụ anwụchirị enwerela onwe ya mana NAPTIP nara ya nwa ahụ nyefee n'aka ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka ana-emegbu emegbu nke Federal Mịnịstrị FCT.

kedu ka ha siri chọpụta na dibia a na-atụ mgbere ụmụaka?

Emerole kwuru na nwaanyi ahụ kọwapụtara na onweghi afọ ime ha kpụrụ.
Na ya bụ dibia na-enye ha ọgwụ na-eme ka ha dị ime.
Orue mgbe ha ga-amụ nwa dịka ndi ụwa chere,dibịa ahu ekuru nwa kunye ha.
Emerole gara n'ihu kwuo: "Anyi na-enyocha ihe nwaanyi a kwuru ka anyi mara ebe ya bụ dibia si ekute ụmụaka ọ na-ekunye ụmụnwaanyị ndị a."
Itu mgbere ụmụaka agbalitela nso nso a n'ọwụwa anyanwụ Naijịrịa.Ọfọdụ ka anwuchịgoro,ọfọdu ka nọ n'ọsọ.

When the Orthodox Church celebrates pregnancy... 

Δεν υπάρχουν σχόλια:

Δημοσίευση σχολίου